Abụ Ọma 150 Toonụ Jaa!+Toonụ Chineke n’ebe nsọ ya.+Toonụ ya na mbara igwe nke na-egosi ike ya.+ 2 Toonụ ya n’ihi oké ọrụ ya.+Toonụ ya dị ka oké ịdị ukwuu ya si dị.+ 3 Jirinụ ịfụ opi too ya.+Jirinụ ụbọ akwara na une too ya.+ 4 Jirinụ obere ịgbà+ na egwú a na-ete na-agba gburugburu too ya.+Jirinụ ụbọ akwara+ na ọjà too ya.+ 5 Jirinụ ájà nke nwere ụda dị ụtọ too ya.+Jirinụ ájà nke na-ada ụda too ya.+ 6 Ihe niile na-eku ume, ka ha too Jaa.+Toonụ Jaa!+