Ilu 28:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Onye na-amụba ihe onwunwe ya site n’ịnara ọmụrụ nwa+ na ụma na-akpakọbara ya onye na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha amara.+ Habakọk 2:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ọ̀ bụ na ndị a niile agaghị eji ya na-atụ ilu,+ na-akwa ya emo, na-ekwukwa ihe na-adịghị mma banyere ya? Ndị mmadụ ga-asịkwa,“‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-enweta ọtụtụ ihe na-abụghị nke ya+—ruo ole mgbe!+—onye na-ekotere onwe ya ụgwọ dị ukwuu! 1 Timoti 6:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Otú ọ dị, ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa+ na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha,+ ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.+
8 Onye na-amụba ihe onwunwe ya site n’ịnara ọmụrụ nwa+ na ụma na-akpakọbara ya onye na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha amara.+
6 Ọ̀ bụ na ndị a niile agaghị eji ya na-atụ ilu,+ na-akwa ya emo, na-ekwukwa ihe na-adịghị mma banyere ya? Ndị mmadụ ga-asịkwa,“‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-enweta ọtụtụ ihe na-abụghị nke ya+—ruo ole mgbe!+—onye na-ekotere onwe ya ụgwọ dị ukwuu!
9 Otú ọ dị, ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa+ na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha,+ ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.+