17 “‘Ekpughela ọtọ nwaanyị na nwa ya nwaanyị.+ Akpọrọla nwa nwaanyị nke nwa ya nwoke mụrụ nakwa nwa nwaanyị nke nwa ya nwaanyị mụrụ iji kpughee ọtọ ha. Ha niile bụ otu ọbara. Ọ bụ omume rụrụ arụ.+
18 Ewebatala ego a kwụrụ+ nwaanyị akwụna ma ọ bụ ego e retara ná nkịta+ n’ime ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị iji mezuo nkwa ọ bụla, n’ihi na ha bụ ihe arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị, ọbụna ha abụọ.
6 N’ihi ya, m buuru iko m nwaanyị gburie wee ziga ya n’ala niile bụ́ ihe nketa Izrel,+ n’ihi na ha mere omume rụrụ arụ+ na ihe nzuzu na-eme ihere n’Izrel.+
12 m wee sị,+ ‘Ndị Filistia ga-agbadata ibuso m agha na Gilgal, emebeghịkwa m ka obi Jehova jụrụ.’ N’ihi ya, m manyere onwe m+ wee chụọ àjà nsure ọkụ ahụ.”