27 N’ihi na a kawo ya aka na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya, mgbe ahụkwa, ọ ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka omume ya si dị.+
10 N’ihi na a ghaghị ime ka anyị niile pụta ìhè n’ihu oche ikpe Kraịst,+ ka onye ọ bụla wee nweta ụgwọ ọrụ ya maka ihe ndị o ji ahụ́ ya mee, dị ka ihe ndị o mere si dị, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+