2 Adịla ngwa ikwu okwu; ekwekwala ka obi gị+ dị ngwa ikwu okwu n’ihu ezi Chineke.+ N’ihi na ezi Chineke nọ n’eluigwe+ ma gị onwe gị nọ n’ụwa. Ọ bụ ya mere okwu gị kwesịrị iji dị ole na ole.+
19 Maranụ nke a, ụmụnna m m hụrụ n’anya. Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa,+ onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa;+