Diuterọnọmi 6:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 kụnye ha n’ime ụmụ gị,+ kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala+ nakwa mgbe i biliri ọtọ. Abụ Ọma 34:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Bịanụ, ụmụ m, geenụ m ntị;+Ọ bụ egwu Jehova ka m ga-akụziri unu.+ Ilu 1:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị,+ ahapụkwala iwu nne gị.+ Ilu 19:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị,+ ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.+ Ndị Efesọs 6:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ+ unu isi n’ime+ Onyenwe anyị, n’ihi na nke a bụ ezi omume:+
7 kụnye ha n’ime ụmụ gị,+ kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala+ nakwa mgbe i biliri ọtọ.