7 kụnye ha n’ime ụmụ gị,+ kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala+ nakwa mgbe i biliri ọtọ.
9 Ọ dịkwa mgbe anyị nwere ndị nna anyị na ha bụ anụ ahụ́, ndị na-adọ anyị aka ná ntị,+ anyị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ̀ bụ na anyị agaghị edo onwe anyị n’okpuru Nna nke ndụ ime mmụọ anyị karị wee dịrị ndụ?+