5 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị ọhụrụ,+ ọ gaghị eso ndị agha gaa agha, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ a ga-amanye ya ime. Ọ ga-anọ n’ụlọ ya ma bụrụ onye a gụpụrụ ịrụ ọrụ ruo otu afọ, ọ ga-emekwa ka nwunye ọ lụrụ ṅụrịa ọṅụ.+
9 Ka gị na nwunye gị ị hụrụ n’anya+ kporie ndụ n’ụbọchị niile nke ndụ gị bụ́ ihe efu nke Chineke nyere gị n’okpuru anyanwụ, n’ụbọchị gị niile bụ́ ihe efu, n’ihi na ọ bụ ya bụ òkè gị ná ndụ+ nakwa n’ọrụ ị gbalịsiri ike na-arụ n’okpuru anyanwụ.
15 O nwere onye na-emeghị otú ahụ, ebe ọ bụ na mmụọ nsọ ka fọdụrụ n’ime ya. Gịnịkwa ka onye ahụ na-achọ? Ọ bụ mkpụrụ nke Chineke.+ Lezienụ mmụọ unu anya,+ ka onye ọ bụla ghara ịghọ nwunye ọ lụrụ n’okorobịa aghụghọ.+