24 “Ma, ka onye na-anya isi nyaa isi na o nwere nghọta+ banyere m, marakwa m, na mụ onwe m bụ Jehova,+ Onye na-egosi obiọma,* na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ụwa;+ n’ihi na ọ bụ ihe ndị a na-atọ m ụtọ,”+ ka Jehova kwuru.
15 ebe ị makwaara na ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ+ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta+ site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.+
20 Ma anyị maara na Ọkpara Chineke abịawo,+ o nyewokwa anyị ikike inwe nghọta+ ka anyị wee mara ezi onye ahụ.+ Anyị na ezi onye ahụ dịkwa n’otu,+ site n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Onye a bụ ezi+ Chineke ahụ na ndụ ebighị ebi.+