12 Kpọkọta ụmụ Izrel,+ ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị na onye mbịarambịa nke nọ n’ime obodo gị, ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe,+ ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke unu+ ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu a.
11 Ndị Beria nwere ezi obi karịa ndị bi na Tesalonaịka, n’ihi na ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha+ Akwụkwọ Nsọ+ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.+
19 Maranụ nke a, ụmụnna m m hụrụ n’anya. Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa,+ onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa;+