11 Mụ onwe m tụgharịrị lee ọrụ niile aka m rụrụ, leekwa ọrụ m gbalịsiri ike rụọ,+ ma, lee! ihe niile bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe,+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla bara uru n’okpuru anyanwụ.+
2 Gịnị mere unu ji na-emefu ego maka ihe na-abụghị nri? Gịnịkwa mere unu ji na-adọgbu onwe unu n’ọrụ n’ihe na-adịghị eju afọ?+ Geenụ m ntị nke ọma ma rie ihe dị mma,+ ka nri na-edozi ahụ́ tọọkwa mkpụrụ obi unu ụtọ nke ukwuu.+
26 N’ihi na olee uru ọ ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o rite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?+ ka ọ̀ bụ gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere+ mkpụrụ obi ya?
27 Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị iji nweta nri nke na-ala n’iyi,+ kama iji nweta nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi,+ bụ́ nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu; n’ihi na ọ bụ ya ka Nna m, bụ́ Chineke, kara akara nke na-egosi na ihe ya masịrị ya.”+