6 Ọ bụkwa n’ugwu a+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emere ndị niile+ oké oriri nke ihe mara abụba,+ oké oriri nke ezigbo mmanya doro edo, nke ihe mara abụba nke ụmị jupụtara na ya,+ nke ezigbo mmanya+ doro edo, nke a zara aza.+
17 Ezi onyinye+ ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa,+ n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa,+ ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.+