16 M ga-eme ka ndị ìsì jee ije n’ụzọ ha na-amaghị;+ m ga-emekwa ka ha jee ije n’okporo ụzọ ha na-amaghị.+ M ga-eme ka ebe gbara ọchịchịrị n’ihu ha ghọọ ìhè,+ meekwa ka ala dị mkputamkpu ghọọ ala dị larịị.+ Ọ bụ ihe ndị a ka m ga-emere ha. M gaghịkwa ahapụ ha.”+
18 “Mmụọ Jehova+ dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa,+
18 ka i meghee anya ha,+ ka i mee ka ha si n’ọchịchịrị+ gaa n’ìhè,+ sikwa n’ikike Setan+ gakwuru Chineke, ka e wee gbaghara ha mmehie ha,+ ka ha wee nwetakwa ihe nketa+ n’etiti ndị e doro nsọ+ site n’inwe okwukwe n’ebe m nọ.’
18 ana m enye gị ndụmọdụ ka ị zụrụ n’aka m ọlaedo+ e ji ọkụ nụchaa, ka i wee baa ọgaranya, zụrụkwa uwe elu na-acha ọcha, ka i wee yiri uwe, ka e wee ghara ịhụ ọtọ gị,+ ihere ewee mee gị, zụrụkwa ọgwụ anya ị ga-ete n’anya gị+ ka i wee na-ahụ ụzọ.