26 Mgbe m gbajiri mkpara unu ji ekonye achịcha,+ ndị inyom iri ga na-emere unu achịcha n’otu ekwú ma na-atụ achịcha ha na-enye unu atụ̀;+ unu ga-eri ihe ma afọ agaghị eju unu.+
51 Ha ga-erikwa ụmụ anụ ụlọ gị na ihe ala gị mepụtara ruo mgbe e kpochapụrụ gị,+ ha agaghịkwa ahapụrụ gị ọka,* mmanya ọhụrụ ma ọ bụ mmanụ ọ bụla, ụmụ ehi gị ma ọ bụ ụmụ ewu na atụrụ gị ọ bụla, ruo mgbe ha bibiri gị.+
21 Eze Zedekaya wee nye iwu, ha wee tụba Jeremaya n’ụlọ mkpọrọ dị n’Ogige Ndị Nche;+ a na-esi n’okporo ámá nke ndị na-eme achịcha ewetara ya otu ogbe achịcha kwa ụbọchị,+ ruo mgbe achịcha gwụrụ n’obodo.+ Jeremaya wee nọgide n’Ogige Ndị Nche.+
16 O wee gaa n’ihu ịsị m: “Nwa nke mmadụ, lee, m ga-agbajisị mkpara e ji ekonye achịcha+ na Jeruselem, ha ga-anọ ná nchegbu mgbe ha na-eri achịcha a tụrụ atụ̀,+ ha ga-anọkwa n’egwu mgbe ha na-aṅụ mmiri a tụrụ atụ̀,+