12 “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova rụchara ọrụ ya dum n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, m ga-eme ka eze Asiria zaa ajụjụ maka ihe obi nganga ya rụpụtara nakwa maka mpako nke anya ya dị elu.+
13 Ma ị sịwo n’ime obi gị, ‘M ga-agbago n’eluigwe.+ M ga-ebuli ocheeze m+ ka ọ dị elu karịa kpakpando+ Chineke. M ga-anọdụ ala n’ugwu nzukọ,+ n’ime ime ebe ugwu.+