Aịzaya
14 N’ihi na Jehova ga-emere Jekọb ebere,+ ọ ga-ahọrọ Izrel ọzọ.+ Ọ ga-emekwa ka ha zuru ike n’ala ha.+ Ndị mbịarambịa ga-esonyere ha, ha ga-araparakwa n’ụlọ Jekọb.+ 2 Ndị dị iche iche ga-akpọrọ ha kpọbata n’obodo nke ha, ụlọ Izrel ga-akpọrọkwa ha ịbụ ihe nketa ha n’ala Jehova ka ha wee bụrụ ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi;+ ndị dọọrọ ha n’agha ka ha ga-adọrọkwa n’agha,+ ndị na-amanyebu ha ịrụ ọrụ ga-anọzi n’okpuru ha.+
3 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ mgbe Jehova ga-eme ka i zuru ike pụọ n’ihe mgbu gị na ná nsogbu gị nakwa n’ajọ ohu ị na-agba,+ 4 na ị ga-amalite ikwu okwu ịkwa emo a megide eze Babịlọn, sị:
“Lee ka onye na-amanye ndị ọzọ ịrụ ọrụ si kwụsị ịmanye ha, lee ka mmegbu sikwa kwụsị!+ 5 Jehova agbajiwo mkpanaka nke ndị ajọ omume, mkpara nke ndị na-achị achị,+ 6 bụ́ onye na-eji oké iwe apịa ndị dị iche iche ụtarị n’akwụsịghị akwụsị,+ onye ji iwe na-emeri mba dị iche iche, na-akpagbukwa ha n’enweghị ihe mgbochi.+ 7 Ụwa dum ezuruwo ike,+ dịkwa jụụ. Ndị mmadụ na-etikwa mkpu ọṅụ.+ 8 Ọbụna osisi junipa+ na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe mere gị, osisi sida nke Lebanọn na-aṅụrịkwa ọṅụ, sị, ‘Kemgbe a kwaturu gị, ọ dịghị onye na-egbutu osisi+ nke na-abịa egbutu anyị.’
9 “Ọbụna Shiol+ nke dị n’okpuru amawo jijiji n’ihi gị ka o wee zute gị mgbe ị na-abata. N’ihi gị, ọ kpọtewo ndị na-adịghị ndụ,+ ndị ndú niile nke ụwa bụ́ ndị dị ka ewu.+ O mewo ka ndị eze niile nke mba dị iche iche si n’ocheeze ha bilie.+ 10 Ha niile malitere ịsị gị, ‘È mewo ka ike gwụ gị dị ka e mere ka ọ gwụ anyị?+ È mewo ka i yie anyị?+ 11 E wedawo nganga gị ala ruo Shiol, ya na ụda nke ụbọ akwara gị.+ A gbasawo ikpuru n’okpuru gị dị ka ihe ndina; ikpuru bụkwa ihe mkpuchi gị.’+
12 “Lee nnọọ ka i siworo si n’eluigwe daa,+ gị onye na-enwu dị ka ìhè, nwa chi ọbụbọ! Lee ka e si mee ka ị daruo ala,+ gị onye na-eme ka ike gwụ mba niile!+ 13 Ma ị sịwo n’ime obi gị, ‘M ga-agbago n’eluigwe.+ M ga-ebuli ocheeze m+ ka ọ dị elu karịa kpakpando+ Chineke. M ga-anọdụ ala n’ugwu nzukọ,+ n’ime ime ebe ugwu.+ 14 M ga-agbago gafee ebe ndị dị elu n’ígwé ojii.+ M ga-eme onwe m ka m yie Onye Kasị Elu.’+
15 “Otú ọ dị, a ga-eweda gị ala ruo Shiol,+ ruo n’ebe kasị mie emi n’ime olulu.+ 16 Ndị na-ahụ gị ga-ekporopụ anya na-ele gị; ha ga-eleru gị anya nke ọma, sị, ‘Ọ̀ bụ onye a bụ onye ahụ nke nọ na-eme ka ụwa maa jijiji, na-emekwa ka alaeze dị iche iche mee mkpatụ,+ 17 onye mere ka elu ala dị ka ala ịkpa, kwatuokwa obodo ndị dị na ya,+ onye na-emeghereghị ndị o ji eji ụzọ ka ha laa?’+ 18 Ndị eze niile ọzọ nke mba dị iche iche, ee, ha niile, ejiriwo ùgwù ha dinara ala, onye ọ bụla n’ili nke ya.+ 19 Ma gị onwe gị, a tụfuola gị dị ka ome a na-asọ oyi, n’enweghị ebe a ga-eli gị.+ I yi ndị e gburu egbu dị ka uwe, bụ́ ndị e ji mma agha magbuo, ndị na-agbada na nkume ndị dị n’olulu,+ dị ka ozu a na-azọ ụkwụ.+ 20 A gaghị ejikọta gị na ha n’ili, n’ihi na i bibiri ala gị, i gburu ndị gị. Ruo mgbe ebighị ebi, a gaghị akpọtụ ụmụ nke ndị na-eme ihe ọjọọ aha.+
21 “Kwadebenụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya n’ihi njehie nke ndị nna nna ha,+ ka ha wee ghara ibili weghara ụwa, wee mee ka obodo jupụta n’elu ala.”+
22 “M ga-ebilikwa megide ha,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
“M ga-ebipụ aha,+ bipụkwa ndị fọdụrụ afọdụ na ụmụ na ụmụ ụmụ,+ n’ime Babịlọn,” ka Jehova kwuru.
23 “M ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe ebi ogwu ga-ebi nakwa ọdọ mmiri ndị ahịhịa amị jupụtara. M ga-ejikwa ázị́zà nke ịla n’iyi zaa ya,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
24 Jehova nke ụsụụ ndị agha aṅụwo iyi,+ sị: “Dị nnọọ ka ọ dị m n’obi, otú ahụ ka ọ ga-eme; dịkwa nnọọ ka m kpebiri, ọ bụ ihe ga-emezu,+ 25 iji gbajie onye Asiria n’ala m,+ ka m wee zọda ya n’ugwu m;+ ka yok ya wee pụọ n’ahụ́ ndị m, ka ibu ya wee pụọkwa n’ubu ha.”+
26 Nke a bụ ihe e kpebiworo megide ụwa dum, nke a bụkwa aka e setịrị esetị megide mba niile. 27 N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha emewo mkpebi,+ ònye pụrụ ịkụghasị ya?+ Ọ gbatịwokwa aka ya, ònyekwa pụrụ ime ka o weghachi ya?+
28 N’afọ Eze Ehaz nwụrụ,+ e kwuru okwu a, sị: 29 “Aṅụrịla ọṅụ,+ gị Filistia,+ ka onye ọ bụla n’ime gị ghara ịṅụrị ọṅụ naanị n’ihi na a gbajiwo mkpara nke onye na-apịa gị ihe.+ N’ihi na agwọ ọjọọ+ ga-esi na mgbọrọgwụ agwọ+ pụta, mkpụrụ ya ga-abụkwa agwọ na-acha ọkụ ọkụ nke na-efe efe.+ 30 Nwa mbụ nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ga na-ata nri dị ka atụrụ, ndị ogbenye ga-amakpukwa ala n’obi iru ala.+ M ga-ejikwa ụnwụ gbuo mgbọrọgwụ gị, a ga-egbukwa ndị fọdụrụ n’ime gị.+ 31 Tie mkpu ákwá, gị ọnụ ụzọ ámá! Kwaa ákwá, gị obodo! Obi ga-alọ unu niile mmiri, Filistia! N’ihi na anwụrụ ọkụ si n’ebe ugwu na-abịa, ọ dịghịkwa onye na-ekewapụ onwe ya n’ime ìgwè ndị agha ya.”+
32 Gịnịkwa ka mmadụ ga-aza ndị ozi+ nke mba ahụ? Na Jehova atọwo ntọala Zayọn,+ ndị nọ n’ahụhụ n’etiti ndị ya ga-agbaba n’ime ya.