15 onye mere ka i jiri ụkwụ gafee nnukwu ala ịkpa nke dị egwu,+ ebe e nwere agwọ ọjọọ+ nakwa akpị, ebe bụkwa ala kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị; onye mere ka mmiri si n’oké nkume siri ike gbapụtara gị;+
18 M ga-eme ka osimiri si n’elu ugwu nke ọhịa na-adịghị na-agbapụta, meekwa ka isi iyi si na ndagwurugwu* na-agbapụta.+ M ga-eme ka ala ịkpa ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị jupụtara, meekwa ka ala mmiri na-adịghị ghọọ isi mmiri.+