17 ‘Anya gị na obi gị dị naanị n’uru na-ezighị ezi,+ dịrịkwa n’ọbara onye aka ya dị ọcha ka ị wụfuo ya,+ dịrịkwa n’irigbu ndị mmadụ nakwa n’ịpụnara ha ihe ka i wee na-eme ihe ndị a.’
2 Agụụ inweta ubi agụwo ha, ha anarawokwa ha n’ike;+ agụụ inweta ụlọ agụwo ha, ha ewegharawokwa ha; ha erigbuwo nwoke na ezinụlọ ya,+ rigbuo nwoke ma weghara ihe nketa ya.+