21 Ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume;+ ha ga-enweta ala a ruo mgbe ebighị ebi,+ ha bụ ome nke ihe m kụrụ,+ ihe aka m rụrụ,+ ka e wee mee ka m maa mma.+
19 Mụ onwe m asịwo, ‘Lee otú m si kpọbata gị n’etiti ụmụ m wee nye gị ala ahụ dị mma,+ bụ́ ihe nketa mara mma n’anya ìgwè mba dị iche iche!’ M wee kwuokwa, sị, ‘Unu ga-akpọ m “Nna m!”+ unu agaghịkwa akwụsị iso m.’
10 “Ụmụ Izrel ga-adị ka ájá dị n’oké osimiri, bụ́ nke a na-apụghị ịtụ atụ̀ ma ọ bụ ịgụta ọnụ.+ Ọ ga-erukwa na n’ebe a na-asịbu ha, ‘Unu abụghị ndị m,’+ a ga-asị ha, ‘Unu bụ ụmụ nke Chineke dị ndụ.’+