Aịzaya
60 “Nwaanyị, bilie,+ mee ka ìhè gị nwuo,+ n’ihi na ìhè gị abịawo,+ ebube Jehova enwukwasịwokwa gị.+ 2 N’ihi na, lee, ọchịchịrị+ ga-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị ga-ekpuchikwa mba niile; ma Jehova ga-enwukwasị gị dị ka ìhè, a ga-ahụkwa ebube ya n’ahụ́ gị.+ 3 Mba niile ga-abata n’ìhè gị,+ ndị eze+ ga-abatakwa n’ìhè gị nke na-enwu gbaa.+
4 “Legharịa anya hụrụ! A kpọkọtawo ha niile.+ Ha abịakwutewo gị.+ Ụmụ gị ndị ikom si n’ebe dị anya na-abịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ bịa wee lekọta ha.+ 5 N’oge ahụ, ị ga-ahụ ya, ihu gị ewee na-egbuke egbuke,+ obi ga-atọ gị ụtọ, aṅụrị ga-ejukwa gị obi, n’ihi na akụnụba nke oké osimiri ga-abịara gị; akụ̀ nke mba dị iche iche ga-abịara gị.+ 6 Ìgwè kamel nke na-aga gidim gidim, bụ́ ụmụ oké kamel nke Midian na Ifa,+ ga-ejupụta n’ala gị. Ndị niile si Shiba+ ga-abịa. Ha ga-ebu ọlaedo na frankinsens bịa. Ha ga-akpọsa otuto Jehova.+ 7 A ga-achịkọta ìgwè ewu na atụrụ niile nke Kida+ n’ebe ị nọ. Ebule ndị si Nebeyọt+ ga-ejere gị ozi.+ Ha ga-agbagote n’elu ebe ịchụàjà m,+ a ga-anabatakwa ha, m ga-achọkwa ọmarịcha ụlọ m mma.+
8 “Ole ndị bụ ndị a feere na-abịa dị ka ígwé ojii,+ dị ka nduru ndị feere na-aga n’oghere ụlọ ha? 9 N’ihi na agwaetiti niile ga na-enwe olileanya n’ebe m nọ,+ ụgbọ mmiri Tashish+ ga na-enwekwa olileanya dị ka ha na-enwebu, iji si n’ebe dị anya bulata ụmụ gị,+ bulata ha na ọlaọcha ha na ọlaedo ha,+ n’ihi aha+ Jehova bụ́ Chineke gị na Onye Nsọ Izrel,+ n’ihi na ọ ga-achọworị gị mma.+ 10 Ndị mba ọzọ ga-ewu mgbidi gị,+ ndị eze ha ga-ejere gị ozi;+ n’ihi na m ga-etiworị gị ihe n’iwe m,+ ma m ga-emere gị ebere n’ihi amara m.+
11 “A ga-eghewe ọnụ ụzọ ámá gị niile oghe mgbe niile.+ A gaghị emechi ha emechi n’ehihie ma ọ bụ n’abalị, ka e wee na-ebutere gị akụ̀ nke mba dị iche iche,+ ndị eze ha ga na-ebutekwa ụzọ.+ 12 N’ihi na mba ọ bụla na alaeze ọ bụla nke na-agaghị ejere gị ozi ga-ala n’iyi; mba ndị ahụ aghaghị ịla n’iyi.+
13 “Ebube Lebanọn, bụ́ osisi junipa, osisi ash, na osisi saịpres, ga-abịara gị n’otu mgbe ahụ,+ iji chọọ ebe nsọ m mma;+ m ga-emekwa ka ebe m gbakwasịrị ụkwụ dị ebube.+
14 “Ụmụ nke ndị na-emekpa gị ahụ́ ga-abịakwute gị kpọọrọ gị isiala.+ Ndị niile na-elelị gị anya ga-ehulata ala n’ọbụ ụkwụ gị,+ ha ga-akpọkwa gị obodo Jehova, Zayọn+ nke Onye Nsọ Izrel.
15 “Kama ịbụ onye a gbahapụrụ kpamkpam na onye a kpọrọ asị, n’enweghị onye na-esi na gị agafe,+ m ga-eme ka ị bụrụ ihe e ji anya isi ruo mgbe a na-akaghị aka, na ihe aṅụrị site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+ 16 Ị ga-aṅụ ara nke mba dị iche iche.+ Ị ga-amịkwa ara ndị eze.+ Ị ga-amara na mụ onwe m, Jehova,+ bụ Onye Nzọpụta gị,+ nakwa na Dike+ nke Jekọb bụ Onye Mgbapụta gị.+ 17 M ga-eweta ọlaedo jiri ya dochie ọla kọpa,+ m ga-ewetakwa ọlaọcha jiri ya dochie ígwè, were ọla kọpa dochie osisi, werekwa ígwè dochie nkume; m ga-eme ka udo bụrụ onye nlekọta gị,+ meekwa ka ezi omume bụrụ onye na-ekenye gị ọrụ.+
18 “A gakwaghị anụ banyere ime ihe ike n’ala gị, ma ọ bụ nụ banyere ibukọrọ ihe mmadụ na itikpọ ihe n’ókè nke ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto. 19 N’ihi na anyanwụ agakwaghị abụrụ gị ìhè n’ehihie, ọnwa na-eti gbaa agakwaghị enye gị ìhè. Jehova ga-aghọrọ gị ìhè na-adịru mgbe ebighị ebi,+ Chineke gị ga-aghọkwa ịma mma gị.+ 20 Anyanwụ gị agakwaghị ada ada, ọnwa gị agakwaghị ala ala; n’ihi na Jehova ga-aghọrọ gị ìhè na-adịru mgbe ebighị ebi,+ oge iru uju gị ga-agwụsịworị.+ 21 Ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume;+ ha ga-enweta ala a ruo mgbe ebighị ebi,+ ha bụ ome nke ihe m kụrụ,+ ihe aka m rụrụ,+ ka e wee mee ka m maa mma.+ 22 Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike.+ Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.”+