63 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+
2 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Unu onwe unu hụrụ ọdachi dum m mere ka ọ dakwasị Jeruselem+ na obodo niile dị na Juda, lee, taa, ha bụ ebe a lara n’iyi, ọ dịghịkwa onye bi n’ime ha.+