9 Gbagoo n’ugwu dị elu,+ gị nwaanyị nke na-ewetara Zayọn ozi ọma.+ Were ike gị tie mkpu, gị nwaanyị nke na-ewetara Jeruselem ozi ọma.+ Tie mkpu. Atụla egwu.+ Gwa obodo ndị dị na Juda, sị: “Leenụ Chineke unu.”+
15 “Lee! N’elu ugwu ka ụkwụ onye na-eweta ozi ọma, bụ́ onye na-ekwusa udo,+ guzo. Juda, mee ememme+ gị dị iche iche. Kwụọ ihe i kwere ná nkwa;+ n’ihi na onye na-abaghị n’ihe agaghị esi na gị+ gafere ọzọ. A ga-ebipụ+ ya kpamkpam.”
15 Oleekwa otú ha ga-esi kwusaa ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?+ Dị nnọọ ka e dere, sị: “Lee ka ụkwụ nke ndị na-ezisa ozi ọma nke ihe dị mma si maa mma nke ukwuu!”+