25 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “A ga-anapụ dike ọbụna ndị ọ dọọrọ n’agha,+ ndị onye na-achị n’aka ike kpụụrụ ga-agbalagakwa.+ Onye ọ bụla nke na-alụso gị ọgụ ka m ga-alụso ọgụ,+ m ga-azọpụtakwa ụmụ gị.+
44 “Ma n’ụbọchị ndị eze ahụ,+ Chineke nke eluigwe+ ga-eme ka otu alaeze+ nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.+ A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ.+ Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa,+ ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi;+
18 ka i meghee anya ha,+ ka i mee ka ha si n’ọchịchịrị+ gaa n’ìhè,+ sikwa n’ikike Setan+ gakwuru Chineke, ka e wee gbaghara ha mmehie ha,+ ka ha wee nwetakwa ihe nketa+ n’etiti ndị e doro nsọ+ site n’inwe okwukwe n’ebe m nọ.’