10 Agụụ agaghị agụ ha,+ akpịrị agaghịkwa akpọ ha nkụ,+ oké okpomọkụ agaghị eme ha, anwụ agaghịkwa acha ha.+ N’ihi na Onye na-emere ha ọmịiko ga na-edu ha,+ ọ ga na-edu ha n’akụkụ isi mmiri dị iche iche.+
14 E wee nye ya ọchịchị+ na ùgwù+ na alaeze,+ ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.+ Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.+
11 Ma ana m asị unu na ọtụtụ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ọdịda anyanwụ+ ga-abịa soro Ebreham na Aịzik na Jekọb nọdụ na-eri ihe na tebụl n’alaeze+ eluigwe;+