Aịzaya 49:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee! M ga-eweliri mba dị iche iche aka m,+ m ga-ewelikwara ndị dị iche iche ihe mgbaàmà m.+ Ha ga-ekuru ụmụ gị ndị ikom n’obi bịa, ha ga-ebukwa ụmụ gị ndị inyom n’ubu ha.+ Aịzaya 60:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 “Legharịa anya hụrụ! A kpọkọtawo ha niile.+ Ha abịakwutewo gị.+ Ụmụ gị ndị ikom si n’ebe dị anya na-abịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ bịa wee lekọta ha.+ Matiu 15:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 O wee zaa, sị: “E ziteghị m ijekwuru ndị ọ bụla ma ọ́ bụghị atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.”+
22 Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee! M ga-eweliri mba dị iche iche aka m,+ m ga-ewelikwara ndị dị iche iche ihe mgbaàmà m.+ Ha ga-ekuru ụmụ gị ndị ikom n’obi bịa, ha ga-ebukwa ụmụ gị ndị inyom n’ubu ha.+
4 “Legharịa anya hụrụ! A kpọkọtawo ha niile.+ Ha abịakwutewo gị.+ Ụmụ gị ndị ikom si n’ebe dị anya na-abịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ bịa wee lekọta ha.+