20 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, na ọ dịkwaghị mgbe ndị fọdụrụ n’Izrel+ na ndị lanahụrụ alanahụ n’ụlọ Jekọb ga-adabere n’onye ahụ nke na-eti ha ihe,+ ha ga-adaberekwa n’ebe Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ nọ, n’eziokwu.+
8 kama ha ga-asị, ‘Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, bụ́ onye si n’ala dị n’ebe ugwu nakwa n’ala niile m chụsasịrị mkpụrụ nke ụlọ Izrel kpọpụta ha wee kpọlata ha,’ ha ga-ebikwa n’ala nke ha.”+
12 ‘N’ihi na a ga-enwe mkpụrụ udo;+ osisi vaịn ga-amị mkpụrụ,+ ala ga-emepụta ihe,+ eluigwe ga-emekwa ka igirigi daa;+ m ga-emekwa ka ndị fọdụrụ+ ná ndị a nweta ihe a niile.+
26 otú a ka a ga-esikwa zọpụta Izrel+ dum. Dị nnọọ ka e dere, sị: “Onye nnapụta ga-esi na Zayọn pụta+ wee mee ka ụmụ Jekọb kwụsị ime omume asọpụrụghị Chineke.+
9 Ma unu bụ “agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ,+ otu ndị pụrụ iche nke Chineke,+ ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma”+ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.+