1 Pita
2 Ya mere, wepụnụ ihe ọjọọ niile+ na aghụghọ niile na ihu abụọ na anyaụfụ na ụdị ikwu okwu azụ niile,+ 2 dịkwa ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ,+ ka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu+ nke dị n’okwu Chineke na-agụ unu agụụ, ka unu wee site na ya toruo nzọpụta,+ 3 ma ọ bụrụhaala na unu edetụwo Onyenwe anyị ire wee hụ na o nwere obiọma.+
4 Ka unu na-abịakwute ya dị ka nkume dị ndụ,+ nke ndị mmadụ+ jụrụ ajụ+ n’eziokwu, ma bụrụ nke Chineke họọrọ, nke dịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya,+ 5 unu onwe unu kwa, dị ka nkume dị ndụ, bụ ndị a na-ewu ka unu bụrụ ụlọ ime mmụọ,+ ka unu wee bụrụ òtù ndị nchụàjà dị nsọ, ka unu wee site n’aka Jizọs Kraịst na-achụ àjà ime mmụọ+ ndị Chineke na-anabata.+ 6 N’ihi na e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Lee! Ana m edo na Zayọn otu nkume, nke a họọrọ, bụ́ nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala, nke dị oké ọnụ ahịa; ọ dịghịkwa onye nwere okwukwe na ya nke a ga-emechu ihu ma ọlị.”+
7 Ya mere, ọ dị oké ọnụ ahịa* n’ebe unu nọ, n’ihi na unu bụ ndị kwere ekwe; ma n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, “otu nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ+ aghọwo isi nkuku,”+ 8 na “nkume ịsụ ngọngọ na oké nkume mmejọ.”+ Ha na-asụ ngọngọ n’ihi na ha na-enupụ isi n’okwu Chineke. Ọ bụ nke a mere e ji họpụta ha.+ 9 Ma unu bụ “agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ,+ otu ndị pụrụ iche nke Chineke,+ ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma”+ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.+ 10 N’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a, unu bụ ndị Chineke;+ unu bụbu ndị a na-emereghị ebere, ma ugbu a, unu bụ ndị e meere ebere.+
11 Ndị m hụrụ n’anya, ana m agba unu ume dị ka ndị ala ọzọ na ndị bi nwa oge+ ka unu na-ezere ọchịchọ anụ ahụ́,+ nke bụ́ ihe ndị ahụ na-alụso mkpụrụ obi ọgụ.+ 12 Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ,+ ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto n’ụbọchị nleta+ ya n’ihi ọrụ ọma+ unu nke ha ji anya ha na-ahụ.
13 N’ihi Onyenwe anyị, doonụ onwe unu n’okpuru+ ihe niile mmadụ guzobere:+ ma ọ̀ bụ eze,+ dị ka onye dị elu, 14 ma ọ̀ bụ ndị ọchịchị, dị ka ndị o zitere inye ndị ajọ omume ntaramahụhụ ma jaa ndị na-eme ihe ọma mma.+ 15 N’ihi na otú ahụ ka Chineke chọrọ ya, ka unu site n’ime ihe ọma nwee ike imechi ọnụ nke ndị na-enweghị ezi uche ji ekwu okwu nzuzu.+ 16 Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nweere onwe ha,+ ma ka nnwere onwe unu ghara ịbụ ihe unu ga-eji na-ekpuchi ihe ọjọọ,+ kama nwerenụ onwe unu dị ka ndị ohu Chineke.+ 17 Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile,+ hụnụ òtù ụmụnna dum n’anya,+ tụọnụ egwu Chineke,+ sọpụrụnụ eze unu.+
18 Ka ndị bụ́ odibo doo onwe ha n’okpuru+ ndị nwe ha n’egwu+ dum kwesịrị ekwesị, ọ bụghị naanị ido onwe ha n’okpuru ndị bụ́ ezigbo mmadụ na ndị nwere ezi uche, kamakwa n’okpuru ndị ọ na-esi ike ime ihe dị ha mma. 19 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ atachie obi n’ihe mwute, taakwa ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi, n’ihi akọ na uche ya n’ebe Chineke nọ, nke a bụ ihe dị mma.+ 20 N’ihi na, gịnị bụ uru ọ bara ma ọ bụrụ na, mgbe unu na-emehie, e wee na-ama unu ụra, unu atachie obi?+ Ma ọ bụrụ na, mgbe unu na-eme ihe ọma ma na-ata ahụhụ,+ unu atachie obi, nke a bụ ihe dị mma n’ebe Chineke nọ.+
21 N’eziokwu, a kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, n’ihi na ọbụna Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu,+ wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.+ 22 Ọ dịghị mmehie o mere,+ a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.+ 23 Mgbe a na-ekwujọ ya,+ ọ dịghị ekwujọgwara.+ Mgbe ọ na-ata ahụhụ,+ o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka+ onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi. 24 Ya onwe ya buuru mmehie anyị+ n’ahụ́ ya n’elu osisi ahụ,+ ka anyị wee sepụ aka ná mmehie+ ma bie ndụ n’ezi omume. Ọ bụkwa “site n’ọnyá ya ka a gwọrọ unu.”+ 25 N’ihi na unu dị ka atụrụ ndị na-akpafu akpafu;+ ma ugbu a, unu alaghachikwuruwo onye ọzụzụ atụrụ+ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi unu.