39 “‘Ihe ndị a ka unu ga na-achụrụ Jehova n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu n’oge a kara aka,+ ma e wezụga onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu ga na-achụ n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ+ unu na àjà ọka+ unu na àjà ihe ọṅụṅụ+ unu na àjà udo unu.’”+
7 Jehova ọ̀ ga-enwe mmasị na puku kwuru puku ebule, ọ̀ ga-enwe mmasị ná mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi?+ M̀ ga-enye ọkpara m maka nnupụisi m, m̀ ga-enyekwa mkpụrụ nke afọ m maka mmehie nke mkpụrụ obi m?+