13 Ya onwe ya ga-ewu ụlọ nsọ Jehova, ya onwe ya kwa ga-eburu ebube ya;+ ọ ga-anọdụ n’ocheeze ya wee na-achị, ọ ga-aghọkwa onye nchụàjà n’ocheeze ya,+ a ga-enwekwa nkwekọrịta+ n’ọrụ abụọ ahụ.
42 A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda+ n’oge ikpe ya na ọgbọ a, ọ ga-amakwa ha ikpe; n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ amamihe Sọlọmọn, ma, lee! e nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.+