Matiu
7 “Kwụsịnụ ikpe ikpe,+ ka a ghara ikpe unu ikpe; 2 n’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe;+ ihe unu jikwa atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.+ 3 Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche?+ 4 Ma ọ bụ, olee otú ị pụrụ isi sị nwanna gị, ‘Chere ka m wepụ irighiri ahịhịa n’anya gị’; ma, lee! ntụhie dị n’anya nke gị?+ 5 Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ntụhie dị n’anya nke gị, mgbe ahụ ka ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.
6 “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ,+ unu atụpụkwarala ézì nkume pel unu, ka ha wee ghara ịzọ ha ụkwụ+ ma tụgharịa dọrie unu.
7 “Na-arịọnụ,+ a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ,+ a ga-emeghere unu. 8 N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta,+ onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa ka a ga-emeghere. 9 N’ezie, ònye n’etiti unu ka nwa ya nwoke+ ga-arịọ achịcha—ọ gaghị enye ya nkume, ka ọ̀ ga-enye ya? 10 Ma ọ bụ, ma eleghị anya, ya arịọ azụ̀—ọ gaghị enye ya agwọ, ka ọ̀ ga-enye ya? 11 Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume,+ lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya ihe ọma karị!+
12 “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu,+ unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ; n’eziokwu, nke a bụ ihe Iwu ahụ na ihe ndị amụma kụziri pụtara.+
13 “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye;+ n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; 14 ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.+
15 “Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha+ ndị na-abịakwute unu n’oyiyi atụrụ,+ ma n’ime ha, ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji.+ 16 Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha.+ Ọ dịghị mgbe ndị mmadụ na-aghọrọ mkpụrụ vaịn n’ogwu ma ọ bụ mkpụrụ fig n’uke, ka hà na-eme otú ahụ?+ 17 Otú ahụ, osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru;+ 18 osisi ọma apụghị ịmị mkpụrụ na-abaghị uru, osisi rere ure apụghịkwa ịmị ezi mkpụrụ. 19 A na-egbutu osisi ọ bụla na-adịghị amị ezi mkpụrụ ma tụba ya n’ọkụ.+ 20 Ya mere, n’ezie, unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.+
21 “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme+ uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.+ 22 Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,+ ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?’+ 23 Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu!+ Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.+
24 “Ya mere, onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.+ 25 Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume. 26 Onye ọ bụla nke na-anụkwa okwu m ndị a ma ọ dịghị eme ha,+ a ga-eji ya tụnyere nwoke nzuzu,+ onye wuru ụlọ ya n’elu ájá. 27 Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ,+ o wee daa, ọdịda ya dịkwa ukwuu.”+
28 Mgbe Jizọs kwusịrị okwu ndị a, otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya;+ 29 n’ihi na ọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike,+ ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ ha.