20 “‘N’ihi na m kụrisịrị yok gị mgbe dị anya gara aga;+ m dọbisịrị agbụ e kere gị. Ma ị sịrị: “Agaghị m ejere gị ozi,” n’ihi na ọ bụ n’ugwu ọ bụla dị elu nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ+ ka ị na-edina jaghee ụkwụ+ gị wee na-agba akwụna.+
6 Jehova wee gwa m n’ụbọchị Josaya bụ́ eze, sị:+ “‘Ị̀ hụwo ihe Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere?+ Ọ na-agbago n’ugwu ọ bụla dị elu,+ na-agakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ka o wee gbaa akwụna n’ebe ahụ.+
22 N’ihe arụ niile ị na-eme nakwa n’akwụna ị na-agba, i chetaghị oge ị bụ nwata, mgbe ị gba ọtọ n’eyighị ihe ọ bụla; ị nọkwa na-agba lịkalịka n’ime ọbara gị.+