19 O wee gbaa ụlọ ezi Chineke ọkụ+ ma kwatuo mgbidi+ Jeruselem; ha gbakwara ụlọ elu ya niile ọkụ, gbaakwa arịa ya niile dị oké ọnụ ahịa ọkụ,+ iji bibie ihe niile.+
27 “‘“Ma ọ bụrụ na unu erubereghị m isi site n’ido ụbọchị izu ike nsọ, gharakwa ibu ibu,+ ma unu eburu ya na-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem n’ụbọchị izu ike, m ga-esunye ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ,+ ọ ga-erepịa ụlọ elu ndị dị na Jeruselem,+ a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.”’”+
2 “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Gaa gwa Zedekaya eze Juda,+ ee, sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn,+ ọ ga-agbakwa ya ọkụ.+
10 N’ihi na ọ bụrụ na unu egbuo ndị agha niile nke ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso unu agha,+ ndị fọdụrụ n’ime ha abụrụ naanị ndị e merụrụ ahụ́ nke ukwuu,+ onye ọ bụla n’ime ha ga-esi n’ụlọikwuu ya bilie gbaa obodo a ọkụ.”’”