2 N’ụbọchị ahụ, ihe Jehova mere ka o pulite+ ga-aghọ ihe ịchọ mma na ihe na-eweta otuto,+ mkpụrụ nke ala ga-aghọkwara ndị Izrel lanahụrụ alanahụ+ ihe e ji anya isi+ na ihe mara mma.
2 Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya, ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị. Ọ dịghị ka onye ukwu, ọ dịghịkwa ebube;+ mgbe anyị ga-ahụ ya, ọ gaghị adị otú ga-eme ka anyị chọsie ya ike.+
8 “‘Jọshụa, nnukwu onye nchụàjà, biko, nụrụ, gị na ndị ibe gị nọ ọdụ n’ihu gị, n’ihi na ha bụ ihe àmà;+ n’ihi na, lee, m na-akpọbata ohu m+ nke bụ́ Ome!+
45 Filip hụrụ Nataniel+ wee sị ya: “Anyị ahụwo onye ahụ Mozis dere banyere ya n’Iwu ahụ,+ onye Ndị Amụma+ dekwara banyere ya, ya bụ, Jizọs, nwa Josef,+ onye Nazaret.”