7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+
18 Olee Chi dị ka gị,+ onye na-agbaghara njehie, nke na-agbaghakwara mmebi iwu+ nke ndị fọdụrụ n’ihe nketa ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma* na-atọ ya ụtọ.+