5 O wee kpọpụta ya n’èzí wee sị: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ, ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha.”+ O wee gaa n’ihu ịsị ya: “Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.”+
17 aghaghị m ịgọzi gị, aghaghịkwa m ime ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri;+ mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá ndị iro ya.+
37 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “‘Ọ bụrụ na a pụrụ ịtụ eluigwe atụ̀, ọ bụrụkwa na a pụrụ ịchọpụta ntọala ụwa,+ mụ onwe m pụkwara ịjụ mkpụrụ Izrel dum n’ihi ihe niile ha mere,’+ ka Jehova kwuru.”
12 N’ihi ya, sitekwa n’aka otu nwoke,+ onye dị ka onye nwụrụ anwụ,+ a mụtara ụmụ dị nnọọ ọtụtụ ka kpakpando dị n’eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.+