17 Ugboro ugboro ka ha na-asị ndị na-adịghị asọpụrụ m, ‘Jehova sịrị: “Udo ga-adịrị unu.”’+ Ha na-agwakwa onye ọ bụla nke na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ya si dị,+ sị, ‘Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị unu.’+
3 Mgbe ọ bụla ha+ na-asị: “Udo+ na obi iru ala!” mgbe ahụ ka mbibi mberede+ ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe mgbu nke na-abịakwasị nwaanyị dị ime;+ ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.+