5 Obi m na-akwara Moab ákwá.+ Ndị si n’ime ya gbapụ eruwo ọbụna Zoa+ na Eglat-shelaịshiya.+ N’ihi na n’ụzọ gbagoro Luhit+—onye ọ bụla ji ákwá na-agbago; n’ihi na ha nọ n’ụzọ Họroneyim+ na-akpasu iti mkpu ákwá banyere oké ọdachi ahụ.
34 “‘Ha etiwo mkpu ákwá na Heshbọn,+ e wee nụ ya n’Iliele,+ ọbụna na Jehaz.+ Ha etiwo mkpu ákwá+ na Zoa,+ e wee nụ ya na Họroneyim,+ ọbụna n’Eglat-shelaịshiya;+ n’ihi na ọbụna mmiri Nimrim+ ga-atọgbọrọ n’efu.