25 M ga-emekwa ka mma agha nke na-abọ ọbọ+ maka ọgbụgba ndụ+ m bịakwasị unu; unu ga-agbakọta n’obodo unu dị iche iche, m ga-eme ka ọrịa na-efe efe bịa n’etiti unu,+ a ga-enyefekwa unu n’aka ndị iro.+
22 N’ikpeazụ, Jehova enwekwaghị ike idi ya n’ihi omume ọjọọ unu, n’ihi ihe arụ unu mere,+ ala unu wee bụrụ ebe a lara n’iyi na ihe ijuanya na ihe a bụrụ ọnụ, n’enweghị onye bi ya, dị ka ọ dị taa.+
2 Jehova bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,+ bụrụkwa onye na-abọ ọbọ; Jehova na-abọ ọbọ,+ na-ewekwa iwe.+ Jehova ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro+ ya, ọ na-eweso ndị iro+ ya iwe.