15 Lee, m nọnyeere gị, m ga-echebekwa gị n’ụzọ niile ị na-aga, m ga-akpọghachikwa gị n’ala a,+ n’ihi na agaghị m ahapụ gị ruo mgbe m meworo ihe m gwara gị.”+
12 O wee sị: “N’ihi na m ga-anọnyere gị,+ nke a ga-abụkwara gị ihe ịrịba ama na ọ bụ m zigara gị:+ Mgbe ị kpọpụtasịrị ndị m n’Ijipt, unu ga-ejere ezi Chineke ozi n’ugwu a.”+
5 Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu gị ụbọchị niile nke ndụ gị.+ M ga-anọnyere gị dị nnọọ ka m nọnyeere Mozis.+ Agaghị m agbahapụ gị, agaghịkwa m ahapụ gị ma ọlị.+