22 N’ihi na ndị m dị nzuzu.+ Ha amaghị m.+ Ha bụ ụmụ na-amaghị ihe; ha abụghị ndị nwere nghọta.+ Ha bụ ndị maara ihe n’ime ihe ọjọọ, ma n’ime ihe ọma, ha bụ ndị na-amaghị ihe.+
28 Ebe ọ bụ na ha achọghị ịmara Chineke dị ka ezi ihe ọmụma si dị,+ Chineke nyefere ha n’aka uche a jụrụ ajụ,+ ka ha wee na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị,+