10 E mesịa, Jọshụa sịrị: “Ọ bụ nke a ka unu ga-eji mata na Chineke dị ndụ nọ n’etiti unu,+ nakwa na ọ ghaghị ịchụpụ ndị Kenan na ndị Het na ndị Haịvaịt na ndị Perizaịt na ndị Gegash na ndị Amọraịt na ndị Jibọs+ n’ihu unu.
26 M na-eti iwu+ ka ndị mmadụ na-ama jijiji n’ihu Chineke nke Daniel ma na-atụ ya egwu n’ókèala niile dị n’alaeze m.+ N’ihi na ọ bụ Chineke dị ndụ nakwa Onye na-adịru mgbe ebighị ebi,+ alaeze ya+ bụ nke a na-agaghị ebibi ebibi,+ ọchịchị ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+
16 Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere?+ N’ihi na anyị bụ ụlọ nsọ+ nke Chineke dị ndụ; dị nnọọ ka Chineke kwuru, sị: “M ga-ebi n’etiti ha,+ na-ejegharịkwa n’etiti ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.”+
9 N’ihi na ha onwe ha na-akọ akụkọ banyere otú anyị si bata n’etiti unu na mbụ, na otú unu si hapụ arụsị+ unu wee bịakwute Chineke ka unu wee bụrụ ohu ezi+ Chineke dị ndụ,+