-
1 Samuel 25:18Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
18 N’egbughị oge, Abigel+ mere ngwa ngwa chịrị narị ogbe achịcha abụọ, burukwa nnukwu ite mmanya abụọ+ na atụrụ ise a kwadebeworo+ na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia ise nke ọka* a ṅara n’ọkụ+ nakwa otu narị achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị+ nakwa mbadamba achịcha mkpụrụ fig+ dị narị abụọ wee dọkwasị ha n’ịnyịnya ibu.
-
-
2 Samuel 16:1Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
16 Mgbe Devid gafetụrụ elu elu ugwu ahụ,+ Zaịba+ onye na-ejere Mefiboshet+ ozi bịara izute ya, ọ kpụkwa ịnyịnya ibu+ abụọ e dokwasịrị ihe e ji anọkwasị ha, ha bu narị ogbe achịcha abụọ+ na otu narị achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị+ na otu narị mkpụrụ osisi na-amị n’oge okpomọkụ+ nakwa nnukwu ite mmanya.+
-