9 “Lee! Ụbọchị Jehova na-abịa, ụbọchị ebere na-agaghị adị n’ihi ọnụma na iwe dị ọkụ, iji mee ka ala a bụrụ ihe ijuanya,+ ka o wee kpochapụkwa ndị mmehie n’ala a.+
11 Mgbe ntakịrị alaka ya kpọnwụrụ, ndị inyom na-abata ga-anyakapụ ha, mụnyekwa ha ọkụ.+ N’ihi na ha abụghị ndị dị nkọ n’ịghọta ihe.+ N’ihi ya, Onye kere ha agaghị emere ha ebere, Onye kpụrụ ha agaghịkwa emere ha amara.+
4 Anya m agaghị emere gị ebere,+ agaghịkwa m enwe ọmịiko, n’ihi na m ga-emeso gị dị ka ụzọ gị niile si dị, ihe arụ gị ga-adị n’etiti gị;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+
14 Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.+ Ọ ga-abịa,+ m ga-emekwa ihe. M gaghị eleghara ya anya,+ m gaghị eme ebere,+ m gaghịkwa agbanwe obi m.+ Ha ga-ekpe gị ikpe dị ka ụzọ gị niile na omume gị niile si dị,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”
5 Ma dị ka ekweghị ekwe+ gị na obi gị nke na-enweghị nchegharị+ si dị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma+ nke ga-abịakwasị gị n’ụbọchị ọnụma+ nakwa n’ụbọchị a ga-ekpughe+ ikpe ezi omume nke Chineke.+