Jeremaya 8:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 M na-eru uju nke na-enweghị ngwọta.+ Obi m na-arịa ọrịa. Jeremaya 9:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 A sị nnọọ na isi m bụ mmiri, anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri!+ M gaara akwara ndị e gburu egbu n’etiti ada bụ́ ndị m ákwá ehihie na abalị.+ Abụ Ákwá 1:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 M na-akwara ihe ndị a ákwá.+ Anya mmiri na-agbapụta m n’anya.+N’ihi na onye nkasi obi nọ m n’ebe dị anya, bụ́ onye ga-eme ka mkpụrụ obi m nwee ume.Ụmụ m aghọwo ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi na onye iro ebuliwo onwe ya elu.+ Abụ Ákwá 2:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Obi ha etikuwo Jehova,+ gị mgbidi nke ada bụ́ Zayọn.+Mee ka anya mmiri na-asọ dị ka iyi, ehihie na abalị.+Emela ka ahụ́ sie gị. Ka nwa anya gị ghara ịkwụsị ịgbapụta anya mmiri.
9 A sị nnọọ na isi m bụ mmiri, anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri!+ M gaara akwara ndị e gburu egbu n’etiti ada bụ́ ndị m ákwá ehihie na abalị.+
16 M na-akwara ihe ndị a ákwá.+ Anya mmiri na-agbapụta m n’anya.+N’ihi na onye nkasi obi nọ m n’ebe dị anya, bụ́ onye ga-eme ka mkpụrụ obi m nwee ume.Ụmụ m aghọwo ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi na onye iro ebuliwo onwe ya elu.+
18 Obi ha etikuwo Jehova,+ gị mgbidi nke ada bụ́ Zayọn.+Mee ka anya mmiri na-asọ dị ka iyi, ehihie na abalị.+Emela ka ahụ́ sie gị. Ka nwa anya gị ghara ịkwụsị ịgbapụta anya mmiri.