Abụ Ákwá
א [Alef]
1 Ewoo, lee ka obodo nke ndị mmadụ jupụtaburu+ na ya si tọgbọrọ n’efu!+
Lee ka nwaanyị nke nweburu ụba mmadụ n’etiti mba niile+ si yie nwaanyị di ya nwụrụ!+
Lee ka onye bụbu eze nwaanyị n’etiti ógbè dị iche iche sizi bụrụ onye a na-amanye ịrụ ọrụ!+
ב [Bet]
2 Ọ na-akwagbu onwe ya n’ákwá n’abalị,+ anya mmiri na-asọda ya na ntì.+
Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị niile hụrụ ya n’anya nke na-akasi ya obi.+
ג [Gimel]
3 Juda agawo biri n’ala ọzọ n’ihi ahụ́ e mekpara ya+ nakwa n’ihi ajọ ohu ọ na-agba.+
Ya onwe ya ebiriwo n’etiti mba dị iche iche.+ Ọ hụghị ebe ọ ga-ezu ike.
Ndị niile na-akpagbu ya akparawo ya aka n’ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya.+
ד [Dalet]
4 Ụzọ niile e si aga Zayọn na-eru uju, n’ihi na ọ dịghị onye na-abịa ememme.+
E mewo ka ọnụ ụzọ ámá ya niile tọgbọrọ n’efu;+ ndị nchụàjà ya na-asụ ude.+
Ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke na-eru uju, ya onwe ya nọkwa n’obi ilu.+
ה [Hee]
5 Ndị na-emegide ya abụrụwo ndị isi.+ Ndị iro ya na-eme ka ọ gbasaghị ha.+
Ebe ọ bụ na Jehova mere ka o ruo uju n’ihi ọtụtụ iwu o mebiri,+
A dọrọwo ụmụ ya n’agha na-aga n’ihu onye mmegide.+
ו [Wọọ]
6 Ịma mma niile nke ada bụ́ Zayọn esiwo n’ahụ́ ya pụọ.+
Ndị isi ya dị ka oké ele ndị na-ahụghị ebe ha ga-ata ahịhịa;+
Ha na-eje ije n’enweghị ume ọ bụla n’ihu onye na-achụ ha.+
ז [Zayin]
7 N’oge Jeruselem nọ n’ahụhụ nakwa n’oge ndị ya nọ n’enweghị ebe obibi, o chetawo
Ihe ya niile dị oké ọnụ ahịa ndị dịwara kemgbe ogologo oge gara aga.+
Mgbe ndị ya dabara n’aka onye mmegide, mgbe ọ na-enweghịkwa onye inyeaka,+
Ndị na-emegide ya hụrụ ya. Ha chịrị ya ọchị mgbe ọ dara.+
ח [Het]
8 Jeruselem emewo ihe doro anya na ọ bụ mmehie.+ Ọ bụ ya mere o ji ghọọ ihe na-asọ oyi.+
Ndị niile na-akwanyere ya ùgwù ejikwaghị ya kpọrọ ihe,+ n’ihi na ha ahụwo ọtọ ya.+
Ya onwe ya kwa na-asụ ude,+ chee ihu n’ebe ọzọ.
ט [Tet]
9 Adịghị ọcha ya dị n’uwe mwụda ya.+ O chetaghị ọdịnihu ya,+
O wee daa ọdịda dị egwu. O nweghị onye nkasi obi ọ bụla.+
Jehova, lee mmekpa ahụ́ m,+ n’ihi na onye iro m ebuliwo onwe ya elu.+
י [Yod]
10 Onye na-emegide ya agbasawo aka ya ibukọrọ ihe ya niile a na-achọsi ike.+
N’ihi na ọ hụwo mba ndị batara n’ebe nsọ ya,+
Ndị i nyere iwu ka ha ghara ịbata n’ọgbakọ gị.
כ [Kaf]
11 Ndị ya niile na-asụ ude; ha na-achọgharị ihe oriri.+
Ha ejiriwo ihe ha niile a na-achọsi ike gbanweta ihe ha ga-eri, ka mkpụrụ obi ha nwee ume.+
Jehova, biko, lee, n’ihi na m dịzi ka nwaanyị na-abaghị uru.+
ל [Lamed]
12 Ọ̀ bụ na o nweghị ihe nke a bụụrụ unu niile ndị na-agafe n’ụzọ? Leenụ anya hụrụ.+
È nwere ihe mgbu yiri ihe mgbu e mere ka m nwee,+
Bụ́ iru uju Jehova kpatara n’ụbọchị oké iwe ya?+
מ [Mem]
13 O siwo n’elu mee ka ọkụ banye n’ọkpụkpụ m,+ ọ na-emerikwa nke ọ bụla.
Ọ gbasawo ụgbụ ka o jide ụkwụ m.+ O mewo ka m laghachi azụ.
O mewo ka m ghọọ nwaanyị tọgbọrọ n’efu. Ọrịa na-arịa m ụbọchị niile.+
נ [Nun]
14 Ọ na-ahụzu iwu niile m na-emebi.+ Ha kekọtara onwe ha n’aka ya.
Ha erutewo m n’olu.+ Ike agwụla m.
Jehova enyefewo m n’aka ndị ka m ike.+
ס [Samek]
15 Jehova esiwo n’ime m tụpụsịa ndị m niile dị ike.+
Ọ kpọwo òkù ka e zukọta megide m, iji kụrisịa ụmụ okorobịa m.+
Jehova azọchawo mkpụrụ n’ebe nzọchapụta mmanya+ nke ada Juda na-amaghị nwoke.+
ע [Ayin]
16 M na-akwara ihe ndị a ákwá.+ Anya mmiri na-agbapụta m n’anya.+
N’ihi na onye nkasi obi nọ m n’ebe dị anya, bụ́ onye ga-eme ka mkpụrụ obi m nwee ume.
Ụmụ m aghọwo ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi na onye iro ebuliwo onwe ya elu.+
פ [Pee]
17 Zayọn agbasapụwo aka ya.+ O nweghị onye nkasi obi ọ bụla.+
Jehova enyewo ndị niile gbara Jekọb gburugburu, bụ́ ndị na-emegide ya, iwu banyere ya.+
Jeruselem abụrụwo ihe na-asọ oyi n’etiti ha.+
צ [Sadee]
18 Jehova bụ onye ezi omume,+ n’ihi na m nupụrụ isi n’ihe o kwuru.+
Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị niile, hụkwanụ ihe mgbu m.
A dọrọwo ụmụ agbọghọ m na-amaghị nwoke na ụmụ okorobịa m n’agha.+
ק [Kof]
19 Akpọkuwo m ndị niile hụrụ m n’anya nke ukwuu.+ Ha aghọwo m aghụghọ.
Ndị nchụàjà m na ndị agadi m ekubiwo ume n’ime obodo,+
Mgbe ha na-achọgharị ihe ha ga-eri ka mkpụrụ obi ha nwee ume.+
ר [Resh]
20 Jehova, lee, anọ m n’oké ihe isi ike. Afọ agbarụwo m.+
Obi agbawaala m+ n’ihi na m nupụrụ isi nke ukwuu.+
Mma agha emewo ka m gbara aka nwa n’èzí.+ Otu ọnwụ ahụ ka a na-anwụ n’ime ụlọ.+
ש [Shin]
21 Ndị mmadụ anụwo otú m si na-asụ ude.+ Ọ dịghị onye na-akasi m obi.+
Ndị iro m niile anụwo banyere ọdachi dakwasịrị m.+ Ha aṅụrịwo ọṅụ n’ihi na ọ bụ gị mere ka ọ dakwasị m.+
Ị ga-eme ka ụbọchị nke ị kpọsara bịa,+ ka ha wee dịrị ka m.+
ת [Tọọ]