9 A ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ: “Lee! Onye a bụ Chineke anyị.+ Anyị enwewo olileanya n’ebe ọ nọ,+ ọ ga-azọpụtakwa anyị.+ Onye a bụ Jehova.+ Anyị enwewo olileanya n’ebe ọ nọ. Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa aṅụrị ná nzọpụta ọ zọpụtara anyị.”+
18 Ya mere, Jehova ga na-atụ anya imere unu amara,+ n’ihi ya ọ ga-ebili imere unu ebere.+ N’ihi na Jehova bụ Chineke nke ikpe ziri ezi.+ Obi ụtọ+ na-adịrị ndị niile na-atụ anya ya.+