4 O wee chịrị ọlaedo ahụ ha chịtara ma jiri ihe e ji akpụ ihe kpụọ ya+ wee mee ka ọ ghọọ ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ.+ Ha wee malite ịsị: “Izrel, ihe a bụ Chi gị, nke dupụtara gị n’ala Ijipt.”+
28 Ya mere, eze natara ndụmọdụ+ wee mee nwa ehi ọlaedo abụọ+ ma gwa ndị ahụ, sị: “Ọ bụ ihe siri ike nke ukwuu unu ịgbagowe Jeruselem. Lee Chineke gị,+ Izrel, nke kpọpụtara gị n’ala Ijipt.”+
29 Ọ bụ naanị na Jihu ahapụghị mmehie Jeroboam+ nwa Nibat ji mee ka Izrel mehie,+ ya bụ, ụmụ ehi ọlaedo,+ nke otu n’ime ha dị na Betel, otu adịrị na Dan.+
16 Ha wee na-ahapụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke ha nyere n’iwu,+ ha wee meere onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ ụmụ ehi abụọ,+ meekwa ogwe osisi dị nsọ,+ ha wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe isiala,+ na-efekwa Bel ofufe;+