16 M wee lee anya, ma, lee, unu emehiewo Jehova bụ́ Chineke unu! Unu emeworo onwe unu nwa ehi a wụrụ awụ.+ Unu emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ Jehova nyere unu iwu ka unu soro.+
9 Ndị niile na-eme ihe oyiyi a pịrị apị bụ ihe efu,+ ihe ndị ahụ ha hụrụ n’anya agaghịkwa aba uru ọ bụla.+ Dịkwa ka ndị àmà ha, ha adịghị ahụ ihe ọ bụla, ha amaghịkwa ihe ọ bụla,+ ka ihere wee mee ndị na-eme ha.+
6 E nwere ndị na-awụfusị ọlaedo dị n’akpa, ndị na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ọlaọcha. Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, o wee jiri ya kpụọ chi.+ Ha na-adara ya n’ala, ee, ha na-akpọrọ ya isiala.+