12 M ga-agabiga n’ala Ijipt n’abalị+ a wee gbuo nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ;+ m ga-emekwa ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ chi niile nke Ijipt.+ Abụ m Jehova.+
20 Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee! m ga-awụkwasị iwe m na ọnụma m n’ebe a,+ wụkwasịkwa ya ụmụ mmadụ na anụ ụlọ na osisi dị n’ọhịa+ na ihe ala mepụtara; iwe m ga-enwurukwa ọkụ, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’+