22 Unu ga-ekekwa ya n’etiti onwe unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu.+ Unu ga-ekenyekwa ndị mbịarambịa bi dị ka ọbịa n’etiti unu,+ bụ́ ndị mụrụ ụmụ n’etiti unu. Ha ga-aghọkwara unu ụmụ amaala n’etiti ụmụ Izrel. Ha ga-eso unu nweta ihe nketa n’etiti ebo niile nke Izrel site n’ife nza.+